Ịhụnanya bụ otu n'ime ihe na-enyere mmụọ na mmadụ aka
Mana anaghị ahụ ya anya
Ị chọrọ ịmata nke a nke ọma
Nwanne m hie asaa n'anya gị
Akụkọ ịhụnanya m bụ nke na-abanye na mmụọ nakwa n'ọkpụkpụ
Onye nke m, onye ụwa mụ na ya bụ otu
Ikechukwu ụwa m
Bịarute nso, bịa tie m obi gị
Elechara m anya n'ụwa niile
M wee kwenye na mụ ga-abụ nke gị
Ma n'ọkọchị ma n'udummiri
N'ezịe ị bụ isi a hụrụ kwawa okpu.
Ị bụ dinta gbaturu obi m
Ego ga-abịa
Akụ na ụba ga-abụ nke anyị
Udo ga-adịrị anyị
Esomokwu ga-agbara anyị ọsọ
N'ihi na ịhụnanya bụ ụzụ kpụrụ anyị
Ihe niile eji enyere ndụ aka
Ga-abụ nke anyị
N'ihi na ha na-abịa n'ebe ịhụnanya dị.
Ị maara ihe ga-eme
Ka anyị biri n'udo
Biko bịa gwa m
Chetakwa na ihe Chukwu dere
O deechala ya.
Abụ m nke Ikechukwu
Ikechukwu bụkwa nke m.
Odee:
Nwaada Chinasa Nkwo Udensi
ADA UDUMEZE
#Adaudumezeconcept
#Igboamaka
#Igbofacts
#Onlinetalkshow
#Gossip
0 Comments