Ticker

Header Ads Widget

Responsive Advertisement

NDỤ

NDỤ

Ihe niile Chukwu kere,
Dị ezigbo mma nke ukwuu,
Ya mere o jiri wéré,
Ndụ chọọ ha mma,
Iji gosipụta ịhụnanya ya.

Ndụ bụ isi mmadụ,
Ndụ bụ akụ na ụba,
Ndụ bụ olileanya mmadụ,
Ndụ kakwa akụ,
Ndụ bụ mmalite mmadụ.

Anyị bụ mma nke ndụ,
Onye bizie nke ya,
Ọ dịrị ya ogologo n'ụwa,
Mana ekpere anyị taa,
Bụ ka anyị nwee ogologo ndụ,
Ma puo isi awọ,
N'ihi na ndụ bụ isi akụ,
Ndụ ka mma,
Karịa ihe eji azụ ya.

Odee: Odz. Chinasa Ndukwe
Ada Udumeze
 (Ode Vam Vam Vam) ©
22/06/23.

Ịma aka abụ Igbo.
( IGBO POETRY CHALLENGE)
For the love of Igbo language.
 IGBO LANGUAGE MUST NOT DIE.
#adaudumezeconcept 
#adachinasa 
#adaudumeze 
#Igbogaadị 
#igbopoetrychallenge 
#ịmaakaabụigbo 
#ịmaakaabụigbo 
#igbopoetrychallenge 
#IgboAmaka 
#akụkọndịigbo 
#igbo 
#ndiigbo
#ndịigbo 
#asụsụigbo #igbolanguage 
#Ohaneze

Post a Comment

0 Comments