NDIDI
Ihe niile dị n'ụwa,
Bịara n'oge ya,
Na mgbe achọrọ ya,
Na-azọghị ọnọdụ ibe ya,
N'ihi na ihe niile nwere oge ya.
Onye o ruru oge ya,
Ọ gbaa ka ụkpaka,
Ụwa abụghị n'ike,
Ndụ mmadụ bụ ndidi,
Ọnọdụ ya bụrụ okwukwe,
Ndidi bụ ije ụwa na ụtọ ya.
Onye ndidi ya dị mkpụmkpụ,
Na-agbakarị chi ya n'ọsọ,
Onye yiri ndidi dịka akwa,
Na-adị ka echi,
Onye nwere ndidi n'ụwa,
Ka chi ya na-emere ebere,
N'ezie, ndidi ka mma,
Ya ka eji ebi ụwa a.
Odee: Odz. Chinasa Ndukwe
Ada Udumeze
(Ode Vam Vam Vam) ©
20/06/23.
Ịma aka Abụ Igbo.
( IGBO POETRY CHALLENGE)
For the love of Igbo language.
IGBO LANGUAGE MUST NOT DIE.
#adaudumezeconcept
#adachinasa
#adaudumeze
#igbopoetrychallenge
#ịmaakaabụigbo
#Igbogaadị
#ịmaakaabụigbo
#igbopoetrychallenge
#IgboAmaka
#akụkọndịigbo
#igbo
#ndiigbo
#ndịigbo
#asụsụigbo #igbolanguage
0 Comments