Ticker

Header Ads Widget

Responsive Advertisement

ABỤ OKIKE (IGBO POEM)

  OKIKE



Ihe niile dị n'ụwa,

Nwere onye mere ya,

Ka ọ dị ire n'ụdị ya,

Onye ọbụla na nke ya,

Ụwa dị etu esiri chọọ ya,

N'ihi na ọ bụ otu aka kpụrụ ya.


Ụmụanụmanụ dịkwa

Bụ ndị ejiri chọọ ụwa mma

Ndị gbara agwa dị iche iche

Ndị bi n'ụlọ

Nakwa ndị bi n'ọhịa

Mana mma nke ndụ

Bụ onyeisi nye ha niile


Ụfọdụ gbara n'ibe n'ibe,

Elu na ala nọọ nke ha,

Udummiri na ọkọchị nọkwa,

Ọnwa na kpakpando n'ụdị ha.


Naanị mma nke ndụ,

Bụ ihe dị iche n'ihe ndị ọzọ,

N'ihi na o nwere agbata,

Anaghị ahụ anya na ndụ ya,

Ịhụnanya na mkpọrọmasị so ya,

Udo, ekworo na anyaụfụ,

Bụzi njirimara mma nke ndụ,

Mana mgbanwe nwere ike ịdị n'abalị,

Ma Chi okike bátá na ndụ,

Mma nke ndụ.


Odee: Odz. Chinasa Ndukwe

Ada Udumeze

 (Ode Vam Vam Vam) ©

17/06/23


Ịmaaka abụ Igbo.

( IGBO POETRY CHALLENGE)

For the love of Igbo language.

 IGBO LANGUAGE MUST NOT DIE.

#adaudumezeconcept 

#adachinasa 

#adaudumeze 

#igbopoetrychallenge 

#ịmaakaabụigbo 

#ịmaakaabụigbo 

#igbopoetrychallenge 

#IgboAmaka 

#akụkọndịigbo 

#igbo 

#ndiigbo

#ndịigbo 

#asụsụigbo #igbolanguage 

#Ohaneze

Post a Comment

0 Comments