Ụwa dị ụtọ ma dịkwa ịtụnanya
Ọtụtụ ihe juru n'ụwa a
Ụfọdụ bụ ndị na-enyere ndụ aka
Ebe ụfọdụ na-akpọkwa ndụ ọkụ
Ụwa a bụ onye maara asụ, ọ sụọ n'ikwe
Onye na-amaghị asụ, ọ sụọ n'ụkwụ ya.
Onye mmiri ụwa juru n'ụlọ ya
Anaghị anụ ụtọ mmanụ aṅụ
Ihe niile na-atọ ya ka akị ilu
Ndị ọzọ kọrọ gbagoo n'elu
Ọ na-abọ ala ka ọkụkọ
Ụwa na-adị ya ka ihe nkiri
Nkatọ ejupụta ya n'obi.
Onye ụwa saara ọba aka ya
Ka nzu na-ejupụta n'obi ya
Ekpere ya mgbe niile abụrụ
Ka ụwa ghara ịgwụ agwụ
Oriri na ọṅụṅụ abụrụ aha ikpeazụ ya
Obi ya agbasaa ka kpakpando
Ụwa a bụ ahịa
Ejighị ike azụ ya
N'ihi na ọbịara ije nwe ụla
Were obi ọma soro ụwa
N'ọnọdụ ọbụla I nwetara onwe gị
Biko chetakwa na ọ gaghị adịgide.
Ekpere bụ ọgwụ kachasị.
Odee:
Nwaada Chinasa Nkwo Udensi
Ada Udumeze
#Adaudumezeconcept
#Igbofacts
#Igboamaka
#Onlinetalkshow
#Gossip
#Poem
0 Comments