Ọ GA-ADỊGIDE
Ịhụnanya bụ otu n'ime
Ihe ndị na-enye ogologo ndụ
Ya mere Eke kere mmadụ
Jiri kee mụ na gị
Onye ọbụla nwere ịhụnanya
N'ụdị nke ya
Ị bụ ụdị ịhụnanya nke m
Ya mere obi mụ na gị ji etikọ
I riele obi m
Na ihe dị ya n'ime
Ịhụnanya gị na-eme m nwatịịtịị n'obi
Eze ọchị gị na-awa
Ka ọnwa abalị
Ụtọ anyị ga-eru n'isi awọ
Ịhụnanya anyị ga-abụ ihe nkiri
Ụwa niile ga-anụ
Maka ịhụnanya anyị
Ọ ga-adịrịrị anyị
Ka anyị si chọọ.
Odee:
Nwaada Chinasa Nkwo Udensi
ADA UDUMEZE
Day 32 of 200.
3 Comments
nice one
ReplyDeleteNkea amaka Nwadaigbo 001
ReplyDeleteAdaumeze jisie ike,ihe i dere maka ya bu eziokwu,maka na ndi bekee kwuru si" Love is sweet when you meet the write person"
thanks
Delete