BỤRỤ NKE NAANỊ M
Ụtọ ndụ m ka ị bụ,
Dịka nri etinyere ńnú,
Ihe m ka ị bụ n'ọchịchịrị m niile,
Bịa bụrụ ọkpụkpọ nke ndụ m,
Ka ụwa m zuo okè dịka Odogwu.
Ihe niile Chukwu kere,
Nwere mmeju ya,
Nwaanyị bụ mmeju nwoke,
Biko, bịa mejuo m mmirimma m,
Enwere m anya abụọ,
Mana naanị gị ka m na-ahụ,
Obi m na-etikwara sọnsọ gị ugo m.
Bụrụ nke naanị m,
Ka ọṅụ anyị zuo okè,
Ka ịhụnanya anyị gbasaa,
Ụzọ anyị ga-adị ka ụzọ mmiri,
Ịhụnanya anyị ga-eru na nkà,
Udo na ọṅụ ga-agbara anyị akaebe,
Ma ị bụrụ nke naanị m.
Odee: Odz. Chinasa Ndukwe
Ada Udumeze
(Ode Vam Vam Vam) ©
18/06/23
#adaudumezeconcept
#adachinasa
#adaudumeze
#Igbogaadị
#igbopoetrychallenge
#igbodịụtọ
#ịmaakaabụigbo
#igbopoetrychallenge
#IgboAmaka
#akụkọndịigbo
#igbo
#ndiigbo
#ndịigbo
#asụsụigbo #igbolanguage
#Ohaneze
0 Comments