Ticker

Header Ads Widget

Responsive Advertisement

EGO

EGO

Ụwa m bụ ụwa ịhụnanya na ekworo,
Udo na esemokwu,
Nchịkọta na mkposa,
Ana m edozi ma na-emebikwa,
Ana m enye olileanya,
Na-etinyekwa ọgbaghara.

Enweghị m ụkwụ ọma,
Mana ana m ejezu ụwa niile,
Enweghị m ọnụ okwu,
Mana ana m ekwusara ụwa niile,
Enweghị m oke enyi,
N'ihi na ụwa niile chọrọ m,
Na ndụ ha niile.

Abụ m mma nke ụwa,
Bụrụkwa ike dị na mmadụ,
Onye rụọ ọrụ ya taa,
M bịara ya echi,
Ọ bụ ihe ụkwụ jetere,
Ka aka na-eweta,
Tupu ọnụ amịcha pịọm.

Odee: Odz. Chinasa Ndukwe
Ada Udumeze
 (Ode Vam Vam Vam) ©
19/06/23

Ịma aka abụ Igbo.
( IGBO POETRY CHALLENGE)
For the love of Igbo language.
 IGBO LANGUAGE MUST NOT DIE.
#adaudumezeconcept 
#adachinasa 
#adaudumeze 
#igbopoetrychallenge 
#ịmaakaabụigbo 
#Igbogaadị 
#ịmaakaabụigbo 
#igbopoetrychallenge 
#IgboAmaka 
#akụkọndịigbo 
#igbo 
#ndiigbo
#ndịigbo 
#asụsụigbo #igbolanguage 
#Ohaneze

Post a Comment

0 Comments