Ticker

Header Ads Widget

Responsive Advertisement

BILIE (IGBO POEM)

  BILIE 



Onye dara n'ala,

Ga-ebili ọzọ,

Mana onye na-atụ ụjọ ọdịda,

Na-enwe nramahụ na mbili.


Mgbe ụwa gwụrụ n'anya gị,

Bilie ma bidokwa n'isi,

Mgbe ụkwụ jụrụ gị oyi,

Bilie ije maka ọdịmma ụwa gị,

Ụwa gbara gị asaa,

Sachaa aka gị ka egbeigwe,

N'ihi na ụtọ ụwa gị dị n'ebimndụ gị.


Nwata dara ugboro ugboro,

Ma bidokwa n'isi

Karịrị okenye na-adabeghị ma otu,

N'ihi na ọ maghị ụtọ akịilu,

Onye mkpụmkpụ enweghị ụjọ ọdịda,

N'ihi na ala dị ya nso,

Onye dara otu ugboro,

Nwere ike ibili ugboro asaa,

N'ihi okwukwe ya.


Odee: Odz. Ada Chinasa 

Ada Udumeze

 (Ode Vam Vam Vam) ©

16/06/23.


Ịma aka abụ Igbo.

( IGBO POETRY CHALLENGE)

For the love of Igbo language.

 IGBO LANGUAGE MUST NOT DIE.

#adaudumezeconcept 

#adachinasa 

#adaudumeze 

#igbopoem 

#ịmaakaabụigbo 

#igbopoetrychallenge 

#IgboAmaka 

#akụkọndịigbo 

#igbo 

#ndiigbo

#ndịigbo 

#asụsụigbo #igbolanguage 

#Ohaneze

Post a Comment

0 Comments