Ticker

Header Ads Widget

Responsive Advertisement

Ọ GA-ADỊGIDE

READ MORE VIA FACEBOOK PAGE.
Ọ GA-ADỊGIDE 

Ịhụnanya bụ otu n'ime
Ihe ndị na-enye ogologo ndụ
Ya mere Eke kere mmadụ
Jiri kee mụ na gị

Onye ọbụla nwere ịhụnanya
N'ụdị nke ya
Ị bụ ụdị ịhụnanya nke m
Ya mere obi mụ na gị ji etikọ 

I riele obi m
Na ihe dị ya n'ime
Ịhụnanya gị na-eme m nwatịịtịị n'obi
Eze ọchị gị na-awa 
Ka ọnwa abalị

Ụtọ anyị ga-eru n'isi awọ
Ịhụnanya anyị ga-abụ ihe nkiri
Ụwa niile ga-anụ 
Maka ịhụnanya anyị
Ọ ga-adịrịrị anyị
Ka anyị si chọọ.

Odee:
Nwaada Chinasa Nkwo Udensi
ADA UDUMEZE
Day 32 of 200.

Post a Comment

3 Comments

  1. Nkea amaka Nwadaigbo 001
    Adaumeze jisie ike,ihe i dere maka ya bu eziokwu,maka na ndi bekee kwuru si" Love is sweet when you meet the write person"

    ReplyDelete