Ticker

Header Ads Widget

Responsive Advertisement

BỊA BỤRỤ NKE M

BỊA BỤRỤ NKE M

Nwa ọma ọsịsọ m
Ka ị bụ eziokwu m niile
Ụwa mụ na gị dị ichè

Ntụtụisi gị bụ sọọ mma
Ọchị gị na-enye m ọṅụ
N'ezịe i zuru okè asa m

Bịa bụrụ nke naanị m
Bịa ka anyị kọwaa ịhụnanya
Nụrụ olu m
Ka obi anyị bụrụ otu

Ihe dị mma rie m ego
Maka gị, Ugomma m
Aga m achụwa ego ma chụta ya
Ịhụnanya anyị ga-eru na nkà.

Odee:
Nwaada Chinasa Nkwo Udensi
ADA UDUMEZE
#Adaudumezeconcept
#Igboamaka
#Igbofacts
#Onlinetalkshow
#Gossip

Post a Comment

0 Comments