Ticker

Header Ads Widget

Responsive Advertisement

IGBO ANYỊ

 IGBO ANYỊ

Nke gị bụ nke gị
Nke anyị bụ nke anyị
Ihe onye kpọrọ nkịta ya
Ka ọ na-aza
Onye kpọọ ọba ya mkpọkọrọ
Agbataobi ejiri ya kpoo ahịhịa

Asụsụ Igbo bụ nke ndị Igbo
Igbo ga-adị!
Gbaa mgbọrọgwụ!
Igbo bụ daachị 
Ọ dị ụtọ ma nwekwa ezigbo ụda na ntị
N'ezịe, Igbo amaka.

Iche na Igbo ga-anwụ?
Igbo ọ ga-adị?
Kedụ obere enyemaka nke gị n'ebe ọnọdụ Igbo dị taa?
Ị maara ede ihe n'asụsụ Igbo?
Ka ọ bụ ọgụgụ bụ nsogbu gị?

Ùgwù na-esi n'ụlọ apụta n'ama
Ọ bụrụ na I mebie nke gị
Kedụ onye ga-emezi ya?
Biko pụtanụ n'igwe ka anyị kwalite asụsụ anyị
Ka ọkụ dị anyị n'aka ghara ịnyụ pịịị 
Anyụkọ mamịrị ọnụ
Ọ gbaa ụfụfụ.

Odee:
Nwaada Chinasa Nkwo Udensi
ADA UDUMEZE

#Adaudumezeconcept
#Igbofacts
#Igboamaka
#Onlinetalkshow
#Gossip

Post a Comment

0 Comments