Mma nke ndụ
Ka anyị niile bụ
Ụwa anyị dịcha iche iche
Ndụ anyị na-adị ịtụnanya
Nye ndị ọzọ
Ihe niile gbara anyị gburugburu
Ndị a na-eri eri
Na ndị a na-aṅụ aṅụ
Nakwa ndị a na-ata ata
Nke onye na-asọ
Ka ibe ya na-achọ
Nke onye riri taa
Ka o bu ala mmụọ
Mana onye richa taa
Ọ chịpụta ya n'ụdị odikpiri
Nwayọọ ka ejula ji aga
Agbataobi gị dịrị gị n'obi
Maka na echi dị ime.
Odee:
Nwaada Chinasa Nkwo Udensi
ADA UDUMEZE
#Adaudumezeconcept
#Igboamaka
#Igbofacts
#Onlinetalkshow
#Gossip
0 Comments