Nwa bụ obi ụtọ nke ezinụlọ niile
Ọ mụrụ nwaanyị
Ọ mụrụ nwoke
Ha niile bụ nwa
Aṅụrị ezinụlọ na-ezu oke
Mgbe ọbụla ákwá nwa dara.
Ụwa nwaanyị dị iche
Nne ewu na-epio ọka
Nwa ya a na-enyo ya
Ebe ọbụla nne kwụsịrị
Ka ụmụ ha nwaanyị na-ebido
N'ezịe nwaanyị bụ ọpụrụiche
Ezinaụlọ na-enweghị nwaanyị
Na-adị ka a gbaara ha izu ọjọọ.
Nwaanyị na-abịa n'ụzọ pụrụ iche
Ha bịara gị ka nwanne
Nne gị adịrị abụọ
Ha bịara gị ka enyị
Ụwa abụrụ gị mmanụ aṅụ
Ha biazịere gị ka nwunye
Obi ụtọ ezinaụlọ gị ezuo oke
Obi nwaanyị na-abụ
Maka ọdịmma na ọganihu nke ezinaụlọ ya
Ọtụtụ ha bụ aba ji ezinụlọ ha
N'ezịe, Chukwu kere nwaanyị
Maka enyemaka nwoke
Nakwa nke ezinaụlọ ha.
Chetakwa na agwa bụ mma nwaanyị.
Odee: Nwaada Chinasa Nkwo Udensi
ADA UDUMEZE
#Adaudumezeconcept
#Igboamaka
#Igbofacts
#Onlinetalkshow
#Gossip
0 Comments