Ticker

Header Ads Widget

Responsive Advertisement

Agụmakwụkwọ Sandwich









Agụmakwụkwọ Sandwich 

Agụmakwụkwọ Sandwich
Agụmakwụkwọ ọsọ na ije
Onye ukwu nọ n'ọsọ
Onye nta nọkwa n'ọsọ
Oke na ngwere na-achụ otu ihe.

Ọ gbara nwoke awọ n'ike
Ọ chapụrụ nwaanyị nwa n'afọ
Onye na-enweghị ụwa ọma
Ụlọ ya agba ọkụ n'ike.

Agụmakwụkwọ Sandwich
Nwa a na-amụ n'otu ọnwa
Ọ ga-ije n'otu ọnwa
Ma gbapụkwa ọsọ n'otu mgbe.

Agụmakwụkwọ Sandwich
Ebe egburu ego ma lié ya n'ike
Onye ukwu na-egbu ego
Onye nta n'otu aka ahụ
Ọ bụ ego ka ahụrụ kwaba ya bụ okpu?
Ego na-eti mkpu mana
O nweghị onye na-anụ ya
Agụmakwụkwọ Sandwich.

Odee:
Nwaada Chinasa Nkwo Udensi
Ada Udumeze
#Adaudumezeconcept
#Igboamaka
#Igbofacts
#Onlinetalkshow
#Gossip

Post a Comment

0 Comments