UGWU NA NDỊDA ỌLỤLỤ
Di ụwa gị bụ di eke Chi gị
Obi unu na-abụ otu
Ịhụnanya unu anaghị ahụ ihe ọjọọ
Ụwa na-abụrụ unu ihueligwe
Obi aṅụrị unu ejupụta ka kpakpando
Nwunye ọma Chi ji gọzie gị
Ezigbo nwaanyị na-eweta udo n'ezinụlọ
Ọchị na-awa n'ihu unu
Ka anyanwụ ụtụtụ
Kwa ụbọchị ka ịhụnanya unu na-abawanye
Ka ebe akọrọ ede n'ugbo
Onye lụọ nke na-abụghị nke ya
Maọbụ chọta akụkụ na-agaghị adaba
Tigbuo zọgbuo na-ewere ọnọdụ
Ihe ga-eme echi na-eme n'otu ụbọchị
Akọmọnụ, ekworo na nkatọ
Na ụmụnna ha ejupụta n'ụlọ
Udo aghaa unu gbafuo
Di bụ ndịdị mana
Tupu I diwe ya, jụọ onwe gị
Ma ị chọtakwara di ụwa gị?
Nwunye bụ ùgwù nwoke
Mana tupu ị chọwa ùgwù ahụ
Jụọ onwe gị ma ọ bụkwa nwunye ụwa gị ka ị chọtara?
Hie asaa n'anya
Ma tinyekwa ya n'ekpere.
Chetakwa na alụmdi na nwunye abụghị ịma aka.O
Odee:
Nwaada Chinasa Nkwo Udensi
ADA UDUMEZE
#Adaudumezeconcept
#Igboamaka
#Igbofacts
#Onlinetalkshow
#Gossip
0 Comments