Ticker

Header Ads Widget

Responsive Advertisement

UGWU NA NDỊDA ỌLỤLỤ

 UGWU NA NDỊDA ỌLỤLỤ



Di ụwa gị bụ di eke Chi gị

Obi unu na-abụ otu

Ịhụnanya unu anaghị ahụ ihe ọjọọ

Ụwa na-abụrụ unu ihueligwe 

Obi aṅụrị unu ejupụta ka kpakpando 

Nwunye ọma Chi ji gọzie gị

Ezigbo nwaanyị na-eweta udo n'ezinụlọ 

Ọchị na-awa n'ihu unu 

Ka anyanwụ ụtụtụ

Kwa ụbọchị ka ịhụnanya unu na-abawanye 

Ka ebe akọrọ ede n'ugbo

Onye lụọ nke na-abụghị nke ya

Maọbụ chọta akụkụ na-agaghị adaba

Tigbuo zọgbuo na-ewere ọnọdụ 

Ihe ga-eme echi na-eme n'otu ụbọchị 

Akọmọnụ, ekworo na nkatọ

Na ụmụnna ha ejupụta n'ụlọ

Udo aghaa unu gbafuo

Di bụ ndịdị mana

Tupu I diwe ya, jụọ onwe gị 

Ma ị chọtakwara di ụwa gị?

Nwunye bụ ùgwù nwoke

Mana tupu ị chọwa ùgwù ahụ

Jụọ onwe gị ma ọ bụkwa nwunye ụwa gị ka ị chọtara?

Hie asaa n'anya 

Ma tinyekwa ya n'ekpere.

Chetakwa na alụmdi na nwunye abụghị ịma aka.O

Odee:

Nwaada Chinasa Nkwo Udensi

ADA UDUMEZE

#Adaudumezeconcept

#Igboamaka

#Igbofacts

#Onlinetalkshow

#Gossip







Post a Comment

0 Comments