Ụdara mmicha m ka ị bụ
Agaghị m ekwe ka ị daa n'ala
Ka ị ghara imetụ n'aja
Ụdara niile dị ụtọ
Mana ị na-atọwa m isi.
Ndụ mụ na gị bụ otu
Ọ dịka mmiri na ncha
Ndụ anyị n'ụwa a
Bụ ndụ ịhụnanya na udo
Idinotu bụ aha ichafụ anyị
Ụwa bugharịwa anyị
Ma ya ekewalakwala anyị
N'ihi na ebe ịhụnanya dị
Ka udo na-adị
Ụtọ anyị ga-eru na nkà.
Odee: Nwaada Chinasa Nkwo Udensi
(ADA UDUMEZE)
#Adaudumezeconcept
#Igboamaka
#Igbofacts
#Onlinetalkshow
#Gossip
0 Comments