Ticker

Header Ads Widget

Responsive Advertisement

ALA AJỤRỤ AJỤ

ALA AJỤRỤ AJỤ

Amaara m Amaara m
Amaara m ala ọma ahụ
Tupu nnwereonwe ha
Ha bụ ndị nweere onwe ha 
Ihe dịka afọ iri isii na ụma
Ha chere na 
Ọ bụ na nnwereonwe
Ka ụwa biri

Oji onye n'ala 
Ọ bụ onwe ya ka o ji
Mpụ na arụ amụọla ụmụaka
N'ala a nweere onwe ya
Ịla ndụ n'iyi abụrụla omenala 
Nkwanye ùgwù na nsọpụrụ
Abụrụla nke ụmụanụmanụ
Udo, ịhụnanya, ịdịnotu
Ejirila ọsọ gbaga n'ala ndị ọzọ

Obodo bụ igwe
Ndị bi na ya bụrụ agaghị aga
Mba, ndị bi na ya bụ ayọn
Atọ etinyere ise bụ asatọ
Anọ etinyere anọ bụkwa asatọ
Ụzọ esi amịcha aka juru eju
Ma bara abara

Ewu na ọkụkọ na-azọzi 
Ndụ ha na ezinụlọ ha
Ahụhụ akwọchaala ụfọdụ isi
Ụwa anyị n'ala a
Abụrụla ụwa ntaramahụhụ
Ụwa a bụziiri anyị ndọlị ndọlị
Kama anyị ga-anwụ 
Ka anyị dọlịwa
Ọ dịkata njọ taa
Ọ ga-adịrịrị mma echi.

Odee: Nwaada Chinasa Nkwo Udensi
ADA UDUMEZE
#Adaudumezeconcept
#Igbofacts
#Igboamaka
#Onlinetalkshow
#Gossip

Post a Comment

0 Comments