Ọtụtụ ihe dị iche iche ka eji mara ndị Igbo nke ịgba Odibo bụ otu n'ime ha.
Ọ bụ otu n'ime ụzọ ndị Igbo si enyere onwe ha aka.
Mgbe elu bụ ala ọsa, ọ na-abụkarị ụmụ nwoke na-agba odibo.
Onye na-eme nke ọma n'azụmahịa ya ga-eji obi aṅụrị bịa kpọrọ nwa/ụmụ okorọbịa ikuziri ha ahịa maọbu ọrụ ya. Site n'otu ahụ nyere ezinụlọ ha aka ma kwadokwaa ha.
Afọ ole ha ga-anọ n'aka Nna ha ukwu tupu etuwe ha ugo na-adịkwa na mkparị ha tupu Nna ha ukwu akpọrọ ha gawa.
Kedụzi ebe mmiri si banye n'opi ụgbọgọrọ?
Ọ bụ na ọkpụisi amaghị akpụ ka ọ bụ agụba adịghị nkọ?
Ọtụtụ ndị odibo bụ ndị na-ezugbu Nna ha ukwu n'ohi ma chefuo na onye fee eze, eze erute ya n'aka.
Ihe niile dị na ngada ka ha chọrọ imetụ aka maọbu nyonye ya anya ma chefuo na ọ bụghị ihe niile na-amụke amụke bụcha ọlaedo.
Anyaukwu na obi ọjọọ ebirila n'ime obi ọtụtụ ndị nna ukwu. Ụfọdụ anaghị enyezi ụmụ odibo ha nri ma ya fọdụzịe idu ha ụlọ ma ha gbasịa odibo
Ụfọdụ ndị nwunye ọga bụzi ekwensu nke a na-ahụ anya nye ndị ụmụ odibo.
Mgbe ọbụla ọ fọdụrụ ọdụ ka ọ bụrụ ewi ka ha na-achọpụta/echeta ụdị ọchị ọjọọ nwa odibo ha chịrị.
Otu aka anaghị atọ ngwugwo
Otu osisi anaghị emebe oké ọhịa.
Ihe emere nke ọma bụ nwamma.
Odee
Nwaada Chinasa Nkwo Udensi
Ada Udumeze
#Adaudumezeconcept
#Igbofacts
#Igboamaka
#Onlinetalkshow
#Gossip
0 Comments