Ticker

Header Ads Widget

Responsive Advertisement

MMIRI NDỤ


MMIRI NDỤ

Ụwa niile bụrụ obi m
Naanị ihe ndị ị ga-ahụ 
Ga-abụ ụtọ m, Ịhụnanya m
Obiọma m, udo m nakwa
Ịdịnotu nke mụ na gị

Mmiri ndụ m ka ị bụ
Ọ nweghị mgbe ị dịghị m oke mkpa
Ihe niile gbasara gị bụ sọ mma
N'ụtụtụ ị na-ajụ m ezigbo oyi
Ị bụ daachị ma bụrụkwa ọpụrụiche na mmiri ndị ọzọ

Mmiri ndụ m ka ị bụ
N'ihi na ihe niile banyere gị
Na-eme m nwatịtị n'obi
Ahụ m niile na-ama jijiji
Mgbe ọ bụla i metụrụ m aka
Obi na-emekwa m pookom pookom
Mgbe ọbụla m bịara gị nso mmiri ndụ m

Ị bụ mmiri ndụ m
Ma bụrụ anyammiri ndị ọzọ
N'ihi na ebe obi gị dị
Ka anya gị na-adị 
Ị nọ m nso 
Ma nọrọ ndị ọzọ n'ebe tere aka.

Odee:
Nwaada Chinasa Nkwo Udensi
ADA UDUMEZE

#Adaudumezeconcept
#Igbofacts
#Igboamaka
#Onlinetalkshow
#Gossip
#POEM

Post a Comment

0 Comments