Ụwa otu onye ajọka
Ya kpatara Chukwu
Jiri kee mụ na gị
Ụwa anyị bụ ụwa
Mmadụ abụọ bịakọrọ ọnụ
Wee bụrụzie otu
Enwere m anya abụọ
Mana ọ bụ sọ gị
Ka ọ na-ahụ
Ebe obi gị na-etiri m
Nke m na-etikwara gị
Ụtọ ndụ m ka ị bụ
Mgbe ọbụla
M lere gị anya n'ihu
Ọ bụ naanị ịhụnanya
Ka m na-ahụ.
Odee:
Nwaada Chinasa Nkwo Udensi
ADA UDUMEZE
#Adaudumezeconcept
#Igbofacts
#Igboamaka
#Onlinetalkshow
#Gossip
0 Comments