Nkụ dị na mba na-eghere ha nri
Mba ọbụla nwere ihe ha jiri biri
E nwere nke ejiri mara ha
Onye ọbụla nwere ọnụ o siri pụta
Ọhafịa bụ ọnụ m
Abụ m agbụrụ Ezema Atịta
Anyị bụ Ọhafịa Ukwu
Mba bu isi achọ isi
Azụ eru ala ka anyị bụ
Ụmụ afụ amaara ka anyị bụ
Ofula ishi mejupụtara anyị n'olu Ọhafịa
Ugwuji Nnaka Igomini bụ mpaghara m
Anyị na-azụ na nkwọ
Nne m mụrụ m n'ụbọchị ahịa nkwọ
Ya kpatara Nna m jiri gụọ m Nnenkwọ
Abụ m Nkwọ Ọhafịa Udumezema
Ada Udumeze ka m bụ
Amarala m onye m bụ
Agaghị m echefu ebe m si.
Ọhafịa wụ Agụ
Agụ anịga ata afịfịa.
Odee: Nwaada Chinasa Nkwo Udensi
ADA UDUMEZE
#Adaudumezeconcept
#Igboamaka
#Igbofacts
#Onlinetalkshow
#Gossip
0 Comments