Ticker

Header Ads Widget

Responsive Advertisement

ỌNWỤ

ỌNWỤ

Onyeọbịa anaghị akpọ òkù
Ọ zaa mgbe a na-akpọghị ya
O nweghị onye na-akpọ gị enyị ya
Mana ị bụ enyị mmadụ niile
Onye ukwu na-agbara gị ọsọ
Onye nta na-agbara gị ọsọ
Mana onye ukwu na onye nta ka ị na-eri

Anaghị eri gị aka azụ
N'ihi na onye ị chọrọ ka ị na-akpọrọ 
Akaọrụ gị emeela ọtụtụ ụmụaka ihe akaja
Ụfọdụ ha bụ ndị a na-edugbu n'ozi
Ebe ụfọdụ ha na-amịcha ahụhụ
Ka obere nwa si amịcha aka ya

O mere ụmụ ọgaranya ha bụrụ ogbenye
Ndị na-eri n'elu na-erizi n'ala n'ihi gị
Oké ọchịchịrị agbaala n'anya ụmụ mmadụ
N'ihi mkpamkpa ị kpara na mberede
Ihe ntọchị niile na-ebutezi oke anyammiri
N'ezinụlọ ụfọdụ n'ihi akaọrụ gị n'ezinụlọ mmadụ

Ụwa dị egwu ma dịkwa omimi
Mmiri na-ezo na nke Okafọ 
Ebe nnukwu anwụ na-eti na be Okonkwọ 
Ọnwụnwa bịara gị, biko kpọwa Akajiụwa 
Ọnwụ bụ ihe dịrị mmadụ niile
Mana oge anyị ga-anwụ bụ ihe dị iche iche.

Odee: Nwaada Chinasa Nkwo Udensi
ADA UDUMEZE
#Adaudumezeconcept
#Igboamaka
#Igbofacts
#Onlinetalkshow
#Gossip

Post a Comment

0 Comments