Ụwa ndị nne dị iche
Chukwu kechara ha
Ma nyekwa ha ikike pụrụ iche
Ọdịmma nke ezinụlọ abụrụ akaọrụ ha
Ọrụ ha n'ezinụlọ
Enweghị ngwụcha ma ọlị
Kedụ nke a ga-agụ ma ghara ibe ya?
Nne bụ onye nkụzi
Dọkịta ka ọ bụkwa
Onye ụkọchukwu ka ọ bụ
Ị hụtụla ezinụlọ nne kọrọ?
Kedụ etu ọ na-adị?
Ụwa na-adị ha ka ọ gwụla
Nna ha tigidezie mkpu
O chee na ọ bụ na mkpu
Ka o biri, ọ piawa ịtalị
Mana otu anaghị abụcha ezie
Arịrịọ anyị kwa ụbọchị
Bụ ka Chukwu gọzịere anyị
Ndị nne nille n'uju
Ogologo ndụ na ahụike
Ka anyị na-ekpere ha
Ugwu bụ nkwanye nkwanye
Mere nwaanyị ji amụta
Nwaanyị ibe ya
Onye fee eze
Eze eruo ya n'aka
Ihe ahụ ị ga-emere nne gị
Mere ya mgbe ọ dị ndụ.
Odee:
Nwaada Chinasa Nkwo Udensi
ADA UDUMEZE
#Adaudumezeconcept
#Igboamaka
#Igbofacts
#Onlinetalkshow
#Gossip
0 Comments