Ụlọakwụkwọ dị mkpa ma dịkwa mma
Mana onye na-enwetaghị ohere ịga
Nwekwara ike ịmụ ihe ọzọ
Ọ bụghị onye kacha gụọ akwụkwọ na-akacha aba uru
Ụlọakwụkwọ bụ maka ọzụzụ ụmụaka
Mana ọzụzụ na-ebidori n'ezinaụlọ dị iche iche
Ya mere nne na nna ji anara otuto agwa ọma ụmụ ha kpara
Nkatọ niile na-agakwara ha n'ihi na mkpụrụ onye kụrụ ka ọ na-aghọrọ.
Ụlọakwụkwọ na-azụpụta ọtụtụ ụmụaka
Ụfọdụ ndị aka abụọ gara ụlọakwụkwọ
Ebe ndị Ụkọchukwu gụkwara akwụkwọ
Otu nzuzo ụfọdụ bụ n'ụlọakwụkwọ ka ha bidoro
Kedụzi maka ndị ntọọ
Ụlọakwụkwọ amaka ma dịkwa ụtọ.
Ụzọ esi egbu oke juru eju ma barakwa abara
Ọtụtụ mgbe ọ bụghị ihe a tụrụ n'ahịa ka a na-azụtacha
Were amamiihe soro ụwa, werekwa nwayọọ n'ihi na ndịdị bụ ije ụwa.
Ọchọ ihe ukwu na-ahụ agba enyị.
Odee.
Nwaada Chinasa Nkwo Udensi
Ada Udumeze
#Adaudumezeconcept
#Igboamaka
#Igbofacts
#Onlinetalkshow
#Gossip
0 Comments