Ụwa m dị ụzọ abụọ
Otu ụzọ ụwa m bụ na mmụọ
Nke ọzọ abụrụ na mmadụ
N'ezịe, otu nne na-amụ
Mana Chi na-eke dị iche iche
Chi m dị iche na Chi ụmụnne m na ụmụnna m
Ụwa m pụrụ iche ma gbakwaa ndị mmadụ gharị
Naanị Chi m mazuru m
Site na ntụtụisi m ruo na mbọ ụkwụ
Amara ya ka m ji asa ahụ
Ma yiri ịhụnanya ya ka uwe mgbada
Ọnọdụ m niile doro ya anya
Karịa mụ onwe m.
Ebe ọbụla m nwetara onwe m
Ọ na-asara m okwu
Dịka aha m siri dị CHINASAOKWU
Mgbe ọbụla m nwere nsogbu
Ọ na-azọpụta m dịka CHIZỌBAM
Mgbe m nọ na mkpa
Ọ na-enyere m aka dịka CHINYEREM
Ọpụpụ na mbata m na-abụ IJEOMA
N'ezịe, ndụ m dị ya n'aka
Ya bụ CHIJINDỤM.
Odee: Nwaada Chinasa Nkwo Udensi
ADA UDUMEZE
#Adaudumezeconcept
#Igboamaka
#Igbofacts
#Onlinetalkshow
#Gossip
0 Comments