Ticker

Header Ads Widget

Responsive Advertisement

Ị MAKWA ONYE Ị BỤ?

Ị MAKWA ONYE Ị BỤ?

Igbo na-amụ kwa ụbọchị ahịa,
Nwaanyị amụrụ n'ahịa Eke,
Bụ Ekemma, Mgbeke, Nneke,
Nwoke abụrụ Nweke, Okeke,
Nwaanyị amụrụ n'ahịa órìè,
Bụ Oriemma, Nneorie, Mgborie,
Nwoke abụrụ Nworie, Okorie,
Nwaanyị amụrụ n'ahịa afọ,
Bụ Afọmma, Mgbafọ, Nneafọ,
Nwoke abụrụ Nwafọ, Okafọ,
Nwaanyị amụrụ n'ahịa ǹkwọ,
Bụ Ǹkwọmma, Nnenkwọ, Mgbaǹkwọ,
Nwoke abụrụ Okoǹkwọ, Nwankwo.

Ị makwa onye ị bụ?
Ihe mbụ ga-akọwa onye ị bụ,
Bụ ụbọchị ahịa ahụ a mụrụ gị,
Nwa afọ Igbo ọ bụla,
Nwere ụbọchị ahịa a mụrụ ya,
Ọ na-egosipụta ụdị mmadụ,
Ị bụ nakwa ụdị ihe ndị,
Na-amasị gị dịka nwa afọ,
Gbaa mbọ mata onye ị bụ taa,
N'ihi na onye na-amaghị,
Ebe mmiri bidoro mawa ya,
Agaghị ama ebe ọ ga-anọ,
Wee kọọ mmiri,
Ụwa ndị Igbo dị iche.

Abụ m Ǹkwọmma n'ụlọ anyị,
Nwaanyị amụrụ n'ahịa ǹkwọ,
Anyị na-azụkwa na ǹkwọ,
Ǹkwọ Ọhafia Udumezema,
Mba bu íshí achọ íshí,
Nwa Ugwuji Nnaka Igbomini,
Ka m bụ n'ezie,
Ala ndị òkè eze,
Maara onye ị bụ taa,
Ka nkọwa gị dị mfe,
Jụọ ese taa,
Gbasara onye ị bụ,
N'ihi na onye ajụjụ, 
Anaghị efu efu ma ncha.

Odee: Odz. Chinasa Ndukwe
Ada Udumeze
 (Ode Vam Vam Vam) ©
21/06/23

Ịma aka abụ Igbo.
( IGBO POETRY CHALLENGE)
For the love of Igbo language.
 IGBO LANGUAGE MUST NOT DIE.
#adaudumezeconcept 
#adachinasa 
#adaudumeze 
#Igbogaadị 
#igbopoetrychallenge 
#ịmaakaabụigbo 
#ịmaakaabụigbo 
#igbopoetrychallenge 
#IgboAmaka 
#akụkọndịigbo 
#igbo 
#ndiigbo
#ndịigbo 
#asụsụigbo #igbolanguage 
#Ohaneze

Post a Comment

0 Comments